IgboNet

 

The Igbo Network

 

Igbo Net

Igbo Mail

 

Igbo Forum

Igbo Net

 Igbo heritage Foundation

My Igbo Net

Igbo Language Center

Igbo Events Calendar

Main | The Rise and Shine of Igbo Women »

September 26, 2004

Maka Odi Mma Ndi Igbo

by Uche Nworah --- Igbo kwenu! Kwenu! Ndi Igbo Kwezuo nu!

Ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ, ndi ikom na ndi inyom, ndi ichie na ndi nze na ọzọ di ichi iche, oke ụnụ efu kwa na ụnụ o! Nke onye chiri, ya zaa o!

Eji mụ aka na ebe ọbụla ụnụ nọ ugbua na enwete ozi nke a, na ụnụ nọ nke ọma, Eji kwa mụ aka na ihe na agazi ru ụnụ, di ka ndi nna nna anyị ha sịrị agọ ọfọ, ka ije ụnụ, ya na aka ọlụ ụnụ na aga ra ụnụ were were.

 

Ọbụ mụ bụ Uche Nworah, ezeudo na Enugwu-Ukwu na ekene ụnụ, asịrị mụ ka mụ were ohere nke a lụtụ aka na ụfọdụ ụmụ ihe na eme gasị na obodo anyị bụ Nigeria, ọkachasi ka osiri were gbasa ma ọbụ kwanụ metụ ta anyị bụ Ndi Igbo.

 

Ụnụ lee anya, ụnụ ga aghọta na anyị bụ Ndi Igbo enwegi zi ọnọdụ ma ọbụ nsọpụlụ na Nigeria, anyị enwe gi zi ọnụ na ekwuru anyị, ndi nile ọnụ na eru na okwu, Ndi Igbo jiri aba mba aha pụ sị go anyị na ụwa nke a, ndi di ka Rt. (Hon) Chief Dr. Nnamdi Azikiwe (Owelle ndi Onicha), Chief Dr. K.O Mbadiwe (Agada gbachiri ụzọ), Dr M. I. Ọkpara (M. I. Power), Chief Dr. Sam Mbakwe (Dee Sam), Eze (Dr.) Akanụ Ịbịam (Eze Ogo), Mazi Mbọnụ Ojike, Chief (Dr.) Nwafọ Orizu, Dr. Alvan Ikoku tinyere ọtụtụ ndi ọzọ nwugoro anwụ, ụdị ndi Late Dr. Mbadiwe lechere anya kpọ ụmụ nwoke timber na caliber.

 

Ike na ha agwụ zi ndi anyị ka nwere ugbua, ndi dị ka Chief Dr. Alex Ekwueme, Dr. Ben Nwabueze, Chief Emeka Ojukwu (Ikemba na Nnewi, Ọnụ na ekwulu ọra na Ana Igbo), Mazị Ụwazuruike, Chief Emeka Anyaọkụ na ụfọdụ ndi ọzọ gasi bụ ọdịnma Ndi Igbo na obi, eji kwa mụ aka na ụnụ ga ekwe na ọbughị ihe nile tara na abalị bụ anwụ nta, ọbụghị kwa ihe nile toro ogologo dị ka eriri bụ agwọ.

 

Na nkọwa, ihe mụ ji na ekwu bụ na ọtụtụ ndi bụ aha Ndi Igbo na aga ghari na

 Advertise here

 eme nke a maka ọdinma nke ha, ya na nke ezi na ụnọ ha sọsọ, ndi di otu a bụ ndi mụ ga asi na ha ele go mkpụrụ obi ha, resi ekwensu, ndi di otu a ka ana eji zi di ka ndi ọlụ ka ewere na etisa ala Igbo, were ihe na eme na Anambra state were ghọta ihe mụ na ekwu,  mgbe oji la wụrụ, ndi dị ka Chris Uba, Chime Nzeribe, Emeka Ofor, Chimaraoke Nnamani na ndi otu ha ga asara Ndi Igbo asịsa. Na ụbọchị ikpe azụ, ha ga aza kwara Chineke ajụjụ gbasa ra aka ọrụ ha na ebe ụmụ (Ndi Igbo) ya nọ.

 

Ọtụtụ Mba dị iche iche, na ụfọdụ ndi mmadụ na emegide kwa obodo ya na ụmụ Israel, ha ga kwa esi otu ahụ zaa ajụjụ, eji mụ aka na ụnụ anụ la ka anyị bụ Ndi Igbo na ụmụ Israel (ndi Jew) siri were me tụ ta.

 

Igwe Osita Agwuna, Eze Enugwu-Ukwu, bụlụ kwa Igwe Ụmụnri ya na Onye ji Ọfọ Ndi Igbo kwuru okwu di egwu mgbe ona eme emume igba Ọfala, ya na emume Ịgụ Arọ na 2001. Osịrị Onye enyelu nya nye, Nye he ri we nụ.  Ihe okwu ya pụtara bụ na Onye Chineke gọziri nye ya akụ na ụba, tinye kwuruo ama mụ ihe, ya mee ka orute ụmụnne na ụmụnna ya, Ndi nile mụ kpọ bụrụ aha na mbụ, ndi ọrụ na ndi ozi Obasanjo na eso etisa ala Igbo, Chineke agọzi go ha nye ha akụ na ụba, ọga aka kwa mma na ha tinye ụfọdụ aku na uba ha na ala Igbo site na idozi obodo, ha nwere ike lụọ ụzọ, tinye igwe na enye ọkụ, lụọ ụnọ akwụkwọ, kwụọ rọ ụmụ akwụkwọ ụgwọ akwụkwọ, ihe ọma ha nwere ike ime na Ala Igbo buru ibu. Ha mee otua, anyi agaghị echefu ha maka na Ndi Igbo na ekwu okwu sị na onye ana ekwu maka ya nwere ihe ọna eme, Onye Chukwu na emere na emekwara ndi ọzọ.

 

Ha nwe kwara ike kpọta ụfọdụ ndi oke enyi ha, ndi oke ozu nile ahu nọ na ochichi na Abuja, ka ha bịa were anya ha were hụ afụfụ anyị na ata na ala Igbo, tupu ha agbacha okporo ụzọ nke ahụ si Asaba were gawa Owere na Port Harcourt, ha ga aghọta na onweghi ihe government etiti na emere Ndi Igbo ma ncha.

 

Ụmụnne mụ na ụmụnna mu, odoro mmadu nile anya, dokwa ewu na ọkụkọ anya na Obasanjo kpọrọ anyị bụ Ndi Igbo asị, obidoro na iwe na ọnụma ojiri were buso anyị agha na ụzọ nke ya mgbe ana alụ agha Biafra, tinye kwuo ro na ụmụ okwu di ichi iche ya na ndi oru ya na ekwu, onwe be gi otu ihe o mere ma ọbụ kwanụ ruo ru Ndi Igbo, e ruo na ike okwa ochichi, Ndi Igbo bụ ndi ana enye nke ajuru aju, ma ọbụ nke erifọrọ erifọ, ya mere na ịga na ụlọ ọrụ di ichi iche nke government nke etiti, enwe gi otu nke nwere isi onye Igbo nọ na isi ya, Enwe ụmụ nne anyị nke welitere isi obere, a la ha ezumike nka na ike. Eche gim na anyị ga zi kwa agba nkịtị na eche ka ihe jiri aka ya gbanwe onwe ya, maka Ndi Igbo na atụ ilu sị na Onye ndi iro gbara gburu gburu, na eche onwe ya nche mgbe nile. Ọpụtaziri na anyị nile ga eke nkwucha, maka na nkwucha abụrọ ụjọ.

 

Ndi Igbo na atụ kwa ilu sị na okenye anaghị anọ na ụlọ ewu amụọ na ogbuli. Anyi aga anọ gba nkịtị ihe ana emebi? Mgbe Adolf Hitler nọ na egbu ndi Jew, ihe so were mee ka onwe ike gaa na iru bụ maka ndi hụrụ ihe ọna eme gba nkịtị, nya bụ na oge eru go mgbe anyị ga elebara ọnọdụ anyị anya. Ya enwe kwa la onye na ime ụnụ ga asi na ọgba sa gị ya, maka na ofu mkpulu aka lụta mmanụ, o zuo aka nile, agwa kwa ntị ma ọnụ gị, egbu pu isi, ntị esoro ya. Ndi Igbo na kwa ekwu okwu sị na ihere anaghị eme onye ara, ka ma na ọbụ ụmụnne ya ka ihere na eme. Nya bụ na ọbụ ndi ihe diri mma ka ihere ga na eme maka na ndi mba ọzọ ga eji ọnọdụu ndi ihe na esiri ike na ụmụnna ha were na agwa ha okwu ma ọbụ were na am ha njakịrị tiri ikọ ha ọnọ.

 

Enwere ike ebe inọ ugbua, ma ọbụ na obodo America, obodo United kingdom ma ọbụ na mpaghara mba uwa nile di ichi iche, ọnọdụ gị amaka, ibi na ezigbo ụlọ, na arụ ezigbo ọrụ, enwe kwara ike iji ego na achụ ego (ihe eji mara Ndi Igbo) ọnwa gwụ e nara nnukwu ego, enwe kwara ike ịgba nwe la akwụ ikike nke ndi Nigeria nara zia akwụkwụ nke obodo ebe ahụ ibi, ọdi cha kwa mma mana buru na obi na ime gi, ika bụ kwa nwa afọ Igbo maka na ọbara na esi isi. Na ime ihe ọma nile ndia mere gi, na kwa echeta ụmụnne gi Ndi Igbo ndi nke ka nọ na Nigeria ji eze na ekpere ekwere, ndi ihe na esiri ike site na mmegbu government etiti Nigeria na emegbu ha.

 

Isi okwu mụ bụ ka iba nye na otu Ndi Igbo ọbụla di gị nso, na akwado ha site na itụ ụtụ gi, ya na ije nzukọ ha, ma ọbụ kwanụ na ụzọ ọbụla inwere ike, na icheta okwu Martin Luther King Jnr. gwara ndi isi oji na America gbasa ra otu ha, omere ka ha mata na onye ọbụla na akwa do gi otu nke nkwụsị mmegbu ndi isi oji na America, na agba nye gị na onye ahụ bụ onye isi oji, aga agụnye ya ka onye ọcha ma ọbụ kwanụ onye iro. Ụnụ ma na Ndi Igbo na asị na Igwe bụ ike, ọbụ kwanụ ezi okwu. Enwere ike ụnụ, ndi nna ụnụ ma ọbụ ndi nna nna ụnụ so lụọ agha Biafra, ya mere ụfọdụ na ime ụnụ achọ gị ịkwado ụmụ otu Biafra di ichi che, ụta adị gịrị ụnụ, kama ghọta kwanụ na otu Biafra nke ugbua di iche na otu ndi mbụ, otu Biafra nke kita abu gi zi ihe ikwa mgbo ka mgbe ochie, ihe di iche oge nke ugbua bụ na ọbụ ọgụgụ isi ka anyị ga eji lụọ agha nke ugbua, otu ndi obodo Czechoslovakia, mba Russia na obodo ndi ọzọ di iche iche siri were lụọ agha inwere onwe ha.

 

Ọbụ rụ  na ịna ekwu maka mmegbu Ndi Igbo na Nigeria, na kwa ede maka ya, nwe ike na edere onye nnọchita anya gi na ulo nzukọ ukwu nke obodo ọbụla ebe ibi, onye ọbụla ga akpụ Biafra na onu, o ga enye kwa aka.

 

Ka anyị na eme nke a, ọdịkwa mma ka anyị nwe ihe ndi oyibo na akpọ plan B (ma nke mbụ emegị, kedu zi ihe ọzọ anyị ga eme?), ọbụrụ na Ndi Igbo ga anọ na ime obodo Nigeria, gịnị ga abụ ọnọdụ anyị? Kedu ka anyị ga esi na aga na iru? Na uche nke mụ (uche onye adị ya njọ), ọdịkwa mma ka anyị nile dụọ onwe anyị ọdụ mara na ezi okwu ndi wụ ezigbo ndi enyi anyị, ya na ndi bụ ọdị mma anyị na obi.

 

Ndi ọchịchị anyị, ya na ndi anyị ga asị na ha bụ ndi anyị ji eje mba ga akwụsị oke nfegharị, ya na oke ashawo ndọrọ ndọ ochịchị eji mara ha, ọga enye aka ma ha kwudo ofu ebe kwudo sie ike, ka anyị nwa bụ ndi ha na anọ chite anya nwe ike inwe obi sike ike ya na nsọpụlụ ebe ha nọ.

 

Ọwụ ezi okwu na ihe eji mara ndiIgbo bụ iji ego na achụ ego, mana anyị lee anya anyị ga ahụ na ihe na ha agba nwe na ụwa nile, ọdi kwa mma ka anyị bụ Ndi Igbo soro kwa na agbanwe, eme gi otua ga ebute oge ịgbanarị anyị, oga eme kwa ndi Hausa, ndi Yoruba

 na ndi ọzọ kwa na Nigeria ga na anọkpa anyị ahụ, ya bụ ka iji ego na achụ ego nke anyị hapụ ịwụ sọ ịzụ ahịa na Idumota, Ochanja ma ọbụ Ariaria market, ka anyị bido na kwa eche echiche gbasara iyiwe ihe ndi oyibo na akpo conglomerates, otu ndi Yoruba si eme, eji mụ aka na ụnụ na anụ aha ndi a: Tejuoso, Adenuga, Balogun, Abiola, Otedola, Dantata, Dangote na ndi ọzọ ga si, isi okwu mụ bụ na Ndi Igbo akalị go ịna atụtụ penny penny na afụ afụ eji mara anyị, nke a mere na ndi ochịchị Nigeria na eji  iwu akụsa ọnọdụ ahịa anyị, anyị nile ga echeta ka ha si were iwu afọ iri were kusa ọnọdụ Ndi Igbo na azụ ahịa ụgbọ ala na Berger, ya na Maza Maza Lagos.

 

Ugbua ha ewere kwa la iwu ndi ọzọ na emegide ndi na atụ ahịa okporoko, akwa ọhụrụ ya na akwa ọkịrịka, akpụkpọ ukwu ya na ngwa ahịa ndi ọzọ di ichi iche. E ji mụ aka na ụfọdi ụmụ afọ Igbo, ndi di ka Annie Okonkwo (Clemco group), Orji Uzor kalu (Slok group) ga eji si ike zụọ ụlọ ahịa ha zụpụta ya, ka okwudo sie ike, na ada ụda ka ụlọ ahịa ndi Yoruba na ndi Awụsa mkpọ buru aha, Oru go mgbe mkparị na njakịrị ana enye, na kwa ama Ndi Igbo ga akwụsị, ụmụ okwu di ka: nna, container mụ nọ na high sea! Ọdị zia ka ọbụ sọ sọ ahịa container na spare parts ka Ndi Igbo na azụ, na anyị enwere zi ụbụlụ ma ọbụ akọ na uche.

 

Ihe mmụta ebe a wu ka Ndi Igbo na gha chi na ulo akwukwo, ndi oyibo sịrị na ọbụ onye nwere mmuta na amamu ihe bụ onye nwere ike, e je na ulo akwukwo di iche iche na uwa nile, ọnụ ọgụ Ndi Igbo na agbada na ike na ike, ihe mere nke a wụ maka oke ọchịchọ ya na oke ntụkwa sị obi na ego ụfọdụ ezi na ụlọ Ndi Igbo nwere, ihe nke a pụtara bụ na mgbe na abịa na ihu, mgbe ndi Yoruba na ndi Hausa ga na eke ọchịchị na Nigeria, anyị bụ Ndi Igbo aga gi zi enwe nke ga eru anyị. Biko nụ, na nụ agbasa ozi a, onye nụ, ya kọrọ ibe ya ka anyị kwụsi iche kwudo sọ nke nta (I gbu ozu!) maka na nke di na iru ka, ya mere na Ndi Igbo na aba ụmụ ha ezigbote afa dị ka Nkeiruka. 

 

Atụmatụ ọzọ ga kwa enyere anyị aka bụ ka Ndi Igbo nile na ụwa nile nwe ifụnanya ebe ibe ha nọ, ka anyị na ego mi omume ndi Jew, ka ha si ejikọta onwe ha na agba nye gị afụfụ na nsogbu nile ha ana anata, ihe ọzọ di kwa n wute bụ omume ufodi ụmụ Igbo, ndi di otu a, ọna eme ha ihere ịsụ asụsụ Igbo, ụfọdụ ha anaghị sị ekwete na ha bụ Ndi Igbo, ya mere na ha agba nwe chala aha na aza zi aha ndi ọcha, ebe a ka mụ sịrị na eto ndi Yoruba na ndi Hausa, na agbanyegi ebe ọbụ la ha nọ, asụsụ ha anaghịapụ ha apụ na ọnụ, ha na aza aha ha na obi ọcha, nke anyị agazi adị iche? Onye ọbụla were ire ya gụọ eze ya ọnụ.

 

Ụmụnne mụ, anyị na anwa kwa nụ, ka ana sịrị Ndi Igbo ego anyị ka agha Biafra kwụsịlị, tinyere ụnọ anyị ndi mba mmiri were, nke ha kpọrọ ‘abandoned property’gbawa anyị aka, anyị eji zi kwa nụ ole bido?

Anyi gbakwa nụ aka were na alị enu ọji, mana nkasị obi anyị bụ ihe ngwere kwuru, ọsi na elu daa, lee anya fe fe na isi si na ọga eto onwe ya maka na ọdịro ofele, ma ọbụrụ na onwegi onye ga eto ya. Ji sie nụ ike, ike ụnụ ada la mba, Chineke ga anọnyere ụnụ na ezi na ụnọ ụnụ, nye ụnụ ọmụmụ na ọzụzụ, Onye nwe anyị ga enye kwa ụnụ ogologo ndụ na ahụ isi ike, meju pụta kwara ụnụ ebum na obi ụnụ nile.

 

Ndewo nu!

 

 

Uche Nworah
London, UK

Posted by Administrator at September 26, 2004 11:48 PM

Comments

jisie ike aka oru gi di mma na ebe umu akwukwo no imelaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaaa

Posted by: nwachukwu fortunetta at February 26, 2006 12:41 PM

Post a comment

Thanks for signing in, . Now you can comment. (sign out)

(If you haven't left a comment here before, you may need to be approved by the site owner before your comment will appear. Until then, it won't appear on the entry. Thanks for waiting.)


Remember me?



 

 

Ahiajoku Lecture Series

Odenigbo Lecture Series

The Kola-Nut Series

Igbo Language Forum

 

 

Powered by ACENetwork

Igbo Foundation | Igbo Heritage Foundation | Ikenga Think Tank